ISI NKE MBỤ
OKWU MMALITE
Ntọala Nchọcha
Ọgụgụ
bụ otu n’ime nka onye na-amụ akwụkwọ kwesiri inweta n’ogo praịmarị. Nke a bụ
ihe dị oke mkpa n’ebe ihe ọmụmụ ndị ọzọ dị bụ nke ọ ga-ahụta onwe ya
n’agụmakwụkwọ praịmarị ya niile. Ihe bụ oke ọrụ nke onye nkuzi bụ ime ka ụmụ
akwụkwọ nwee ezi ntọala n’ebe ọgụgụ dị. Nka mmụta ọgụgụ dị mkpa niihi na ọ
na-eweta ọganihu na ngalaba mmụta niile. Ọ kachasị mkpa maka na ọ na-akwalite
ọgụgụ isi na nka mmụta nke mmadụ (Dechant, 1980). Onye nchọcha na-eche na o
nwere ihe jikọtara ọgụgụ na echiche. Ọ na-eche echiche ma chemie ya nke ọma bụ
onye ahụ nke na-agụ ihe ọgụgụ nke ọma kwa mgbe (Ogenyi, 2006).
Ọgụgụ
bụ nka. Dị ka nka ndị ọzọ, mmadụ ga-enweriri nka ọgụgụ ka o wee nwee ike isonye
n’ụwa ọ nọ na ya. E nwere usoro dị iche iche onye nkuzi asụsụ na-agbaso iji wee
kuziri ụmụ akwụkwọ nka ọgụgụ dị ka usoro Abịdịị, usoro Ahụ-Ekwue, Usoro Akụkọ
na usoro Ncheta/Nkwagide.
N’usoro Abịdịị, onye nkuzi asụsụ
na-akụziri ụmụ akwụkwọ etu e si agụpụta abịdịị site na - A B CH D. Ọ na-aka mma
ibu ụzọ mụa abịdịị ndị nnukwu tupu abịdịị ndị obere.
N’usoro
Ahụ - Ekwue, onye nkuzi na-edepụta okwu ndị nwere mkpụrụedide atọ maọbụ anọ ka
ụmụ akwụkwọ supee ma gụa. Iji maatụ: oke, aka, anya, akwa, akpa.
N’usoro
Akụkọ, ụmụ akwụkwọ na-amụ ọgụgụ site n’ịkọ akụkọ. Nke a na-eme n’ụzọ dị iche
iche. O nwere ike ịbụ akụkọ n’ọnụ nwekwa ike bụrụ na tepu. Ụmụ akwụkwọ ga-akọ
akụkọ a ugboro ugboro wee rue mgbe ha buru ya n’isi.
N’usoro
Ncheta/Nkwagide ụmụ akwụkwọ na amụ ọgụgụ site n’ige ntị na-ikwugarị ihe ha
nụrụ, ụmụ akwụkwọ na-ege ntị n’ihe ọgụgụ kwa mgbe na-eto n’ịbụ ezigbo ndị ọgụụ.
Ndị ọrụ aka dị ka ndị ọkpụ blọkụ, ndị
ọkpụ ụzụ, ndị kapịnta, ndị na-agbaihe ọkụ, ndị ọchụ nta, ndị nka na ndị ọrụ
ugbo bụ ndị nwere ọrụ nka n’ụdị dị n’akụkụ nke ha. Site n’onyinye na nka ha
nwere ka ha ji egbo mkpa. N’otu aka ahụ, onye nwere mmụta site n’ọgụgụ na-enwe
ọnọdụ n’ebe ndị gụrụ akwụkwọ na ndị nwere nghọta nọ n’obodo.
N’usoro echiche a, ọgụụ anaghị agba
mbọ ịghọta mbunuche odee. Ọtụtụ ihe bụ mbunuche e ji na-agụ ihe ọgụgụ. A na-agụ
iji wee nwee ọgụgụ isi, ozi gbasara ihe, mmadụ maọbụ isiokwu. N’ogo praịmarị,
mbunuche ime nchọcha na nghọta echiche ndị mmadụ na-abụ na klasị dị elu. Na
klasị nta, ihe ha na-emekarị bụ ịmata mkpụrụ edide, ịgụpụta mkpụrụ okwu na ahịrịokwu.
N’oge a na-ezu ike, a na-agụ ihe ọgụgụ iji wee nweta obi ụtọ.
Ihe ndị a ka a na-eme iji nwee izu ike. Ịmụ
ihe bụ ụzọ e si enweta ezi ọgụgụ. N’ọmụmụ ihe, a na-agụmi ma na-agụsi ihe ọgụgụ
ike iji wee gafee n’ule akwụkwọ. Ịji
ezigbo nka ọgụgụ na-eweta ọganihu
n’ọmụmụ na nkuzi asụsụ. Dị ka Alo (2001) si wee kwuo, ọgụgụ bụ ngwa dị oke mkpa
mmadụ ji amụ ma na-esonye n’akụnaụba ọgbara ọhụrụ. N’agbanyeghi nke a, ọgụgụ
na-akwado mmadụ n’ọrụ nwadiala. Ọ na-eme nke a site n’inye ya ike ịnara na
ịyọchapụta ihe ndị niile e deturu n’akwụkwọ iji wee nye aka chepkwaba ahịrị,
ụda na njimara ndụ ọha obodo. Baldeh (1990) dere iji kwado ihe ndị ọkammụta ndị
ọzọ kwuru gbasara ọgụgụ. N’arụmarụ ụka ya, ọ kọwara na ọgụgụ na odide na-enyere
ụmụ mmadụ aka inweta ihe. Enyemaka a na-eweta mgbamume nke na-akwalite isonye
n’ọchịchị onye kwuo uche ya n’obodo a haziri ahazi. Ndị ọka mmụta niile
n’agbanyeghi ebe onye tozuru etozu kwekọrịtara na ọgụgụ bụ isi ntughe n’usoro
agụmakwụkwọ (Mgbodile, 1991). Ọtụtụ na ndị ọkachamara n’usoro agụmakwụkwọ
ebidwo na-eti mkpu n’ihe gbasara ọdịda n’agụmakwụkwọ dị n’obodo ọkachasị
Naịjịrịa.
Ọtagburuagụ (2001) na-egosi na ebe e
nwere ọtụtụ asụsụ dị ka Naịjịrịa, ịgụ akwụkwọ ụmụ akwụkwọ na-adabere karịa na
mbọ ụlọ akwụkwọ. Ma ụlọ akwụkwọ enweghị ngwa ọrụ ha ga-eji wee mejupụta ihe ndị
nne na nna n’ụlọ ebe ụmụ akwụkwọ si wee pụta tụrụ anya a n’aka ha, n’agbanyeghi
na ụmụ akwụkwọ bịara n’aka ha ka ha nweta mmụta.
Ụfọdụ ntọala na-emetụta ọgụgụ ụmụ
akwụkwọ na-esite n’inye ụmụ akwụkwọ ohere ọgụgụ site n’aka ndị nne na nna na
ndị nkuzi nakwa usoro agụmakwụkwọ enwere bụ nke enweghi ike ịkpalite mmụọ ha
n’inye ha nkwado. Ntọala akụnaụba nne na nna na ntọala agụmakwụkwụ ha na-enwe
nnukwu mmetụta n’ ọgụgụ na mmụta akwụkwọ ha. Ụmụ akwụkwọ si n’ezinaụlọ a gụrụ
akwụkwọ nwekwa ego na-agụ ọgụgụ nke ọma karịa ụmụ akwụkwọ sị n’ezinaụlọ agụghị
akwụkwọ ma ha enweghi ego. Ndị gụrụ akwụkwọ na-azụtara ụmụ akwụkwọ ha akwụkwọ
ya na-ngwa ọgụgụ ndị ọzọ bụ nke na-akpalite mmọọ ha ịmụ ka e si agụ mgbe ha ka
dị obere. N’otu aka ahụ, nwata akwụkwọ si n’ezinaụlọ akụnaụba dị na-enwe ezigbo
ngwa ọgụgụ na akwụkwọ nke na-eme ka o nwee ezigbo agwa na mmasị n’ ọgụgụ. N’otu
aka ahụ, ụmụ ndị ọka mmụta, ndị nkụzi na ndị ọrụ bekee na-eme nke ọma n’ule
karịa ụmụ ndị na-azụ ahịa na ndị ọrụ aka dị iche iche.
Ubahakwe (1973) kwuru na nka ọnụnụ
ihe na okwukwu okwu ụmụ akwụkwọ na-adabe n’ahụmihe ha. Ọ na-ahịa ahụ ịghọta
ọgụgụ ma ọ bụrụ na ahụmihe eyitaghị nghọta ọgụgụ. Iji maatụ, ọ bụrụ na ụmụ
akwụkwọ si n’ime obodo a gụa akụkọ gbasara ndụ ndị nọ n’obodo mepere emepe,
aghọtaazaa akụkọ ha ga-adị iche na nke ụmụ akwụkwọ nweelara nghọta ndụ ndị nọ
n’obodo mepere emepe site n’ahụmihe. Ntọala ahụmimihe nwata akwụkwọ Naịjịrịa
na-apụta ihe n’ụdị dị iche na nke si na ngwa ọmụmụ n’akwụkwọ egwuregwu ọ gụrụ.
Unoh (1968) depụtara ihe ndị a dị ka
ihe dị mkpa n’asụsụ nwata akwụkwọ ga-amata ka o wee nwee ike meta nke ọma na
òtu mkpụrụ okwu, ndọkọ ahịrịokwu, ngwaa, akara edide, na usoro mmebe okwu. O
kwuru na naanị ma nwata akwụkwọ nwere ezigbo nghọta ihe ndị a niile, ọgụgụ
edemede na mmekọrịta ya ga-ajọ njọ.
Itsuokor (1991) chọpụtara na
gburugburu mmadụ nke nwere ike ịmetụta ọgụgụ aghọtaazaa na ngosi gụnyere ụdịrị
ụlọ akwụkwọ nwata akwụkwọ gụrụ na ya, ụdịrị ndị nkụzi kụziiri ya, ntọala
ezinaụlọ, mgbanwe ụlọ akwụkwọ maọbụ nkwụsị maka mkpatara dị iche iche. Ihe ndị
a niile ga-emetụta nka agụmakwụkwọ nwata akwụkwọ, mmasị ọgụgụ n’emume ngosi
nchemi echiche ya.
Okwor na Enyiobi (1986) kwuru na
mgbado anya ndị nne na nna na-enye ụmụ ha na ụdị mgbado anya ha na-enye ha na-emetụta
nka ngosi ụmụ akwụkwọ n’ụlọ akwụkwọ. Ndị nne na nna ga-enye ụmụ ha n’ọrụ skuul
ha oge, nke a ga-arụ ọrụ dị ka ihe mkpalite mmụọ nke ga-eweta mgbakwunye na
mmasị ọgụgụ n’emume ngosi nchemi echiche ụmụ ha. Ha gara n’ihu na-ekwu na mbọ
ndị nne na nna na-emetuta emume ngosi ụmụaka n’asụsụ ha. Mgbe nne na nna
enweghị ike ịnọrụ ala, nke a na-emetụta emume ngosi ụmụaka niihi na ụmụaka
anaghị atụkwasi obi n’ihe ha na-amụ maka obere nlekwasa anya nke a na-enye ha.
Ha gara n’ihu na-ekwu na ọbụrụ na ngwa nke na-eme ka nwata akwụkwọ na-aga n’ihu
n’ọmụmụ adịghị, nwata ahụ agaghị enweta ọkpụrụkpụ ihe mgbakwasa ụkwụ. E nyeghi
nwata akwụkwọ ọkpụrụkpụ ihe mkpalite mmụọ ga-eme ka ọ ghara ịmeta nke ọma.
Ma mgbe ụfọdụ, nke a anaghị adịcha
ire n’aka ụmụ akwụkwọ si n’ezinaụlọ akụnaụba dị. Ahụmihe ndị ọmụmụ nkụzi
nwetara n’ebe ngosipụta ihe ọmụmụ ha na-egosi na ụmụ akwụkwọ enweghi akwụkwọ
na-ebu ụzọ eme ihe omume ọgụgụ ha karịa ndị nwere akwụkwọ. Ihe nlere anya a bụ
ihe ịtụnanya niihi na ihe a na-ahụbu atụgharịzịa n’akụkụ nke a. Ike kwa,
enweghi ngwa ọgụgụ bụ ihe na-akpalite mmụọ ụmụ akwụkwọ ndị a ịgụ mgbe ọbụla ha
nwere ohere ibite akwụkwọ n’aka ụmụ akwụkwọ ibe ha maọbụ n’ọba akwụkwọ. E nwere
ndị nne na nna agụghị akwụkwọ, ha enweghi ego ịzụta ezigbo ngwa ọgụgụ ma ha
amakwaghi uru ngwa ọgụgụ bara. Ọtụtụ ụmụ akwụkwọ ndị Naijịrịa sonyere na ndị dị
etu a. Akwụkwọ ọgụgụ ha na-ahụ anya izizi bụ n’ụlọ akwụkwọ ndị praịmarị ebe
akwụkwọ a ga-agụ na klaasị bụ naanị akwụkwọ ọgụgụ ha ga-enwe.
Ntọala ndị ọzọ nwere mmetụta na mbọ
na ọgụgụ ụmụ akwụkwọ gụnyekwara agbụrụ na-eziputa ụdị omeme mmadụ site n’aka
fere aka. Mgbe ụfọdụ ụmụ akwụkwọ na-eñomi inwe isi akwụkwọ maọbụ enweghi isi
akwụkwọ site n’aka ndị bu ha ụzọ n’ezinaụlọ. N’aka nke ọzọ, ịhụnanya na
akpọmasị ụmụ akwụkwọ na ngwa ọgụgụ dị ka akwụkwọ ọgụgụ ha, usoro ọgụgụ na ndị
nkuzi na-enwekwa mmetụta n’ ọgụgụ.
Echiche izugbe n’aka ndị nkwado mmụta
na ndị ọha obodo bụ na ọgụgụ ụmụ akwụkwọ praịmarị dara ada. Ihe a na-ahụ ụbọchi
niile na-egosi na ọgụgụ kanọ n’agba mbụ n’obodo a bụ Naịjịrịa.
Mbunuche nchọcha nke ọha bụ ịchọpụta
ntọala onye na nka ọgụgụ igbo: ka o si metuta ụmụ akwụkwọ praịmarị. Nchọcha a
na-agbado ụkwụ n’ịchọpụta ma: ntọala akụnaụba ụmụ akwụkwọ o nwere mmetụta na
nka ọgụgụ ụmụ akwụkwọ praịmarị; etu nkwado ndị nne na nna si emetụta nka ọgụgụ
ụmụ akwụkwọ praịmarị; etu ntọala ọgụgụ akwụkwọ nne na nna si-emetụta nka ọgụgụ
ụmụ akwụkwọ praịmarị; na etu inwe mmasị ọgụgụ ụmụ akwụkwọ si n’ezinaụlọ ndị a
gụrụ akwụkwọ si di iche na nke ndị si n’ezinaddụlọ agụghị akwụkwọ. Ndị klaasị
nke ise ka a ga-eji mee nchọcha a niihi na a tụụ anya na ndị klaasị nke ise
ga-agụta ihe ọgụgụ nke ọma.
Ọgụgụ bụ ngwa dị oke mkpa iji wee
nweta nka dị iche iche na ihe mmadụ tosiri ịmata ka o wee tozuo na ndụ ya. Ọ bụ
ihe dị oke mkpa na ụmụ akwụkwọ ga-enwe ezigo mmasị n’ịgụ akwụkwọ ma sikwa etu a
kwalite usoro agụọazaa. Ọ bụ site n’ihe dị etu a ka e ji wee malite ọmụmụ a iji
wee chọpụta ntọala ónyē na nka ọgụgụ Igbo, ka osi metuta ụmụ akwụkwọ ọkachasị
ndị nọ n’ụlọ akwụkwọ nke ogo praịmarị.
Nsogbu Nchọcha
Echiche izugbe n’aka ndị nkwado mmụta
na ndị ọha obodo bụ na ọgụgụ ụmụ akwụkwọ praịmarị dara ada. Ihe a na-ahụ ụbụchi
niile na-egosi na ọgụgụ n’obodo a bụ Naịjịrịa kanọ n’agba mbụ. Ọtụtụ ụmụ
akwụkwọ si n’ụlọ akwụkwọ praịmarị ejighi ezigbo ntọala ọgụgụ banye sekọndịrị
nke nta. Nke a na-egbochi ịghọta akwụkwọ ọgụgụ na ihe omume a na-enye ha. Ụdị
ọnọdụ dị etu a na-ebute emeghi nke ọma n’ule ha ji apụta na praịmarị. Nwaogu
(1973) na-egosi na e wezuga nka inwe ike ọgụgụ, mmadụ ga-abụ ogbi n’ụzọ nghọta,
ịmata ihe, ahụmihe nke ndụ ma bụrụ onye nnọrọmele karịa isonye n’iketa oke
n’amamihe nke ụwa.
Nsogbu ụmụ akwụkwọ na-enwe n’ọgụgụ
na-esitekarị n’enweghị nghọta mpụtara mkpụrụ okwu. Ọtụtụ ụmụ akwụkwọ na-ewere
nghọta ọbụla ha chepụtara nye okwu ha amaghị nghọta ya, ma site etu a, ha
anaghị enwe nghọta ederede ha na-agụ. Naanị ma ụmụ akwụkwọ nwere nghọta mpụtara
mkpụrụ okwu, ha agaghị enwe ike kọwaa mpụtara mkpụrụ okwu a na-ekwu maka ya.
Nsogbu nchọcha a wee bụrụ kedu ka
ntọala onye si emetuta nka ọgụgụ Igbo nke ụmụ akwụkwọ praịmarị n’okpuru ọchịchị
Nsụka n’Enugu Steeti.
Mbunuche Nchọcha
Mbunuche nchọcha a bụ ịchọpụta etu
ntọala ónyē si-emetuta nka ọgụgụ Igbo: ka ntọala onye si metuta ụmụ akwụkwọ
praịmarị niile dị na Nsụka. Nchọcha a na-agbado ụkwụ n’ịchọpụta:
Ma
Etu
nkwado ndị nne na nna si-emetụta nka ọgụgụ ụmụ akwụkwọ praịmarị
Etu
ntọala ọgụgụ akwụkwọ nne na nna si-emetụta nka ọgụgụ ụmụ akwụkwọ praịmarị.
Etu
inwe mmasị ọgụgụ ụmụ akwụkwọ si n’ezinaụlọ ndị gụrụ akwụkwọ si di iche na nke
ndị si n’ezi n’ụlọ agụghị akwụkwọ.
Uru Nchọcha
Ndị
dị iche iche ga-erite uru na nchọcha a bụ ndị a:
Ụmụ akwụkwọ, ndị nne na nna, ndị
nkuzi, ndị nhazi mmụta na ndị odee.
Nchọcha a ga-eme ka ụmụ akwụkwọ nwee
ezi mmasị n’ ọgụgụ. Ọ ga-enyekwara ndị nne na nna aka ịmata mkpa ọgụgụ dị na
ndụ ụmụ ha na ịmata ihe a ga-eme ka ha na-enye ụmụ akwụkwọ ezigbo nkwado n’
ọgụgụ.
Site na nchọcha a, ndị nkuzi ga-enwe
ike kwalite ezi mmasị na ọgụgụ n’ebe ụmụ akwụkwọ nọ ma si etu a kwalitekwa
agụmakwụkwọ ha. N’ime nke a, ha ga-ewube ezigbo ọba akwụkwọ usoro ọgụgụ na ngwa
ọmụmụ ihe n’ụlọ akwụkwọ. N’otu aka ahụ, akwụkwọ ụlọ akwụkwọ wepụtara a ga-agụ
nwere ike ịbụ nke ga-akwalite mmasị ọgụgụ.
Ọ ga-eme ka ndị nhazi mmụta mata ihe
na-eme na ụmụ akwụkwọ na-enwe mmasị maọbụ anaghị enwe mmasị n’ ọgụgụ. Nchọcha a
ga-emekwa ka a mata ihe na-ebuta ụmụ akwụkwọ enweghị nghọta ihe ha gụrụ. Ịmata
ihe ndị a ga-eme ka ndị nhazi akwụkwọ wepụta ngwa ga-akwalite mmasị ụmụ akwụkwọ
ma meekwa ka ọgụgụ na-aga n’ihu.
Ndị ode akwụkwọ agụmagụ ga-enwetakwa
uru n’ihe ọmụmụ a makana ka ha na-amata ebe mmasị ụmụ akwụkwọ dị n’ ọgụgụ ka ha
ga-esite na nchọpụta a wee nwee ike dee
akwụkwọ maka ụmụ akwụkwọ ma ndị si na ntọala ebe a gụrụ akwụkwọ ma ndị si n’ebe
a gụghị akwụkwọ.
Oke Nchọcha
Ebe a ga-anọ mee nchọcha a bụ na
Nsụka dị n’Enugu Steeti nke Naịjịrịa. A ga-anọ n’ụlọ akwụkwọ praịmarị niile dị
na Nsụka mee nchọcha a. Isiokwu oke nchọcha a ga-agbado ụkwụ n’ịmata ntọala
onye na nka ọgụgụ Igbo: ka o si metuta ụmụ akwụkwọ praịmarị dị na Nsụka.
Ajụjụ Nchọcha
Ka e wee hazie usoro nchọcha a, e
weputara ajụjụ nchọcha anọ. Ha bụ:
Olee
etu ntọala akụnaụba ụmụ akwụkwọ si-emetụta nka ọgụgụ ha?
Kedu
ka nkwado ndị nne na nna si-emetụta nka ọgụgụ ụmụ akwụkwọ?
Olee
etu ogo agụmakwụkwọ nne na nna si-emetụta nka ọgụgụ ụmụ akwụkwọ?
Kedu
ka inwe mmasị ọgụgụ ụmụ akwụkwọ si n’ezinaụlọ ndị gụrụ akwụkwọ si dị iche na
nke ndị si n’ezinaụlọ agụghị akwụkwọ.
Ụmaokwu
1.
Ọ
dịghị ndịiche dị n’etiti ihe nnweta miin nka ọgụgụ ụmụ akwụkwọ si n’ezinaụlọ e
nwere nnukwu akụnaụba na ndị si n’ezinaụlọ e nwere obere akụnaụba.
2.
Ọ
dịghị ndịiche dị n’etiti ihe nnweta miin nka ọgụgụ ụmụ akwụkwọ nwere nkwado ndị
nne na nna na ndị e enweghị nkwado ndị nne na nna.
3.
Ọ
dịghị ndịiche dị n’etiti ihe nnweta miin nka ọgụgụ ụmụ akwụkwọ nne na nna ha
gụrụ akwụkwọ na ndị nne na nna ha agụghị akwụkwọ.
FOLLOW US