Type Here to Get Search Results !

ADỊMIRE NGWA NKỤZI NỤRỤLELE NA MMETA NKE ỌMA ỤMỤAKWỤKWỌ SINỊỌ SEKỌNDỊRI N’ ỌMỤMỤ AGHỌTAAZAA IGBO N’ OKPURU ỌCHỊCHỊ NSUKA NA STEETI ENUGWU

ỤMI EDEREDE 

Isiokwu nchọcha a bụ adịmire ngwa nkụzi nụrụlere na mmeta nke ọma ụmụakwụkwọ Sinịọ Sekọndịrị n’ ọmụmụ aghọtaazaa Igbo, n’okpuru ọchịchị Nsụka. Asụsụ bụ ihe bara uru nke ukwu na mmekọrịta mmadụ na ibe ya. Asụsụ Igbo bụ otu n’ ime asụsụ atọ: Igbo, Awụsa na Yoruba nke Gọvụmenti Naịjirịa kwadoro ka a na-akụzi n’ ụlọkawụkwọ dị na Naịjirịa. N’ ọmụmụ asụsụ Igbo aghọtaazaa bụ otu n’ ime alaka a na-akụzi n’ ụlọakwụkwọ ebe a na-akụzi Igbo. aghọtaazaa bụụru ụmụakwụkwọ nsogbu n’ ọmụmụ asụsụ Igbo n’ ihi na ọ na emetụta mmeta nke ọma ha n’ ule dị iche dịka S.S.C.E. Ọ bụ nke a mere onye nchọcha ji bagide ime nchọcha a iji chọpụta adịmire ngwa nkụzi nụrụlere na mmeta nke ọma ụmụakwụkwọ n’ ule aghọtaazaa. Onye nchọcha hibere ajụjụ nchọcha ise nke dabeere na mbunuche nchọcha a iji wee duzie nchọcha a, tinyere ụmaokwu ise. Ụdị nchọcha e ji mee nchọcha a bụ nke kwazi eksperimentalụ. Ọnụọgụ e ji mee nchọcha bụ ụmụakwụkwọ dị puku ise na atọ (5003) ebe ndị e seere dị nari ise (500). Ngwa e ji mee nchọcha a bụ ajụjụ nnwale tupu na ajụjụ nnwale nsonaazụ. Ọ bụ n’ ogo akara ndịmiche 0.05 ka a nwalere ụmaokwu. Ọ bụ miin na standad Divieshọn ka e ji tụcha data. Ihe a chọpụtara na nchọcha a gosiri na ngwa nkụzi nụrụlere, jenda na mpaghara ebe a rụnyere ụlọakwụkwọ na-emetụta ụmụakwụkwọ n’ okpurụ ọchịchị Nsụka na mmeta nke ọma n’ ule aghọtaazaa Igbo. Site na nchọpụta nchọcha a, onye nchọcha na-atụnye uche na ndị nkụzi kwesiri iji ngwa nkụzi ọkachasi ngwa nkụzi nụrụlere na-akụzi aghọtaazaa, O kwesiri na Gọvụmenti ga-enye ndị nkụzi ọzụzụ mmụgharị, tinyere inye ndị nkụzi nọ n’ ime obodo ngwa nkụzi nụrụlere na ụgboala ga na- ebuga ha akwụkwọ iji gba ha ume.

Project detailsContents
 
Number of Pages84 pages
Chapter one Introduction
Chapter two Literature review
Chapter three  methodology
Chapter  four  Data analysis
Chapter  five Summary,discussion & recommendations
ReferenceReference
QuestionnaireQuestionnaire
AppendixAppendix
Chapter summary1 to 5 chapters
Available documentPDF and MS-word format


DOWNLOAD COMPLETE WORK 

All  listed topics on our website are available project materials in PDF and MS word files, well supervised and approved by lecturers who are intellectual in their various fields of discipline,  documented to assist you with complete, quality and well organized researched work.  if you can't find what you're looking for feel free to contact us.

Feel free to contact us chat with us on WhatsApp
Hello, How can I help you? ...
Click me to start the chat...