ỤMỊ EDEREDE
Nchọcha a lebara anya n’adịmire ngwa nkụzi kọmputa na mmeta nke ọma ụmụakwụkwọ n’agụmagụ Igbo n’ụlọakwụkwọ sinịọ sekọndịrị na zonu mmụta Ishielu na steeti Ebonyi. Ihe kpaliri mmụọ onye nchọcha ime nchọcha a bụ maka ndaghachi azụ na emetaghị nke ọma ụmụakwụkwọ sinịọ sekọndịrị n’agụmagụ Igbo. Iji nweta mbunuche nchọcha a, ajụjụ anọ na ụmaokwu anọ duziri ya. Nchọcha a lebakwara anya na ntụlegharị agụmagụ nke metụtara atụtụ nkọwa, atụtụ mmụgharị, nchọcha ahụrụ anya na nchịkọta ntụlegharị agụmagụ. Ụdị nchọcha e ji mee nchọcha a bụ nke “Quasi experimental”. Ebe e mere nchọcha a bụ na zonu mmụta Ishielu na steeti Ebonyi. Ndị eji mee nchọcha a bụ ụmụakwụkwọ sinịọ sekọndịrị nke abụọ SSII dị puku asatọ, nari atọ na iri asatọ na asaa (8, 387) n’ọnụọgụgụ. Onye nchọcha ji usoro nsere tụmbọm tụmbọm wee sere ụmụakwụkwọ dị narị abụọ (200) mee nchọcha a. Ngwa nchọcha eji mee nchọcha a bụ nnwale ajụjụ ederede n’agụmagụ Igbo NAEAI bụ nke nwere ajụjụ iri nke onye nchọcha ji aka ya wepụta. Onye nchọcha nyefere ndị ọkammụta mmadụ atọ ngwa nchọcha a ka ha nyochaa. Eji ngwa nkụzi kọmputa n’usoro nkụzi lekchọ depụta ajụjụ ndị ahụ. Onye nchọcha ji ihe ụmụakwụkwọ nwetara na nnwale mbido tụmadị nnwale mmechi nweta ihe nchọcha bụ nke a hazịrị site na mgbakọ na mwepu miin na ndịpụ na izugbe. Ụmaokwu dị na nchọcha ka eji “Analysis of Covariance” ANCOVA nwalee n’ogo akara mpụtara ndịmiche 0.05. A chọpụtara na ejighi ezi ngwa nkụzi kụziere ụmụaka agụmagụ Igbo na-ebute emetaghị nke ọma ha. Mpaghara ebe ụlọakwụkwọ dị na-emetụtakwa emetaghị nke ọma ụmụakwụkwọ na ndị ọzọ. Site n’ihe ndịa onye nchọcha chọpụtara ka ọ tụnyere aro na ndị gọọmenti ga-agba mbọ chịkọba ọgbakọ nkụzi ihe iji kụziere ndị nkụzi maka iji ngwa nkụzi kọmputa kụzie agụmagụ Igbo. Ndị na-akụzi asụsụ Igbo n’ụlọakwụkwọ sekọndịrị ga na-eji ngwa nkụzi kọmputa akụzi agụmagụ Igbo. E kwesiri ka e tinye ngwa nkụzi kọmputa na kọrịkulum eji azụ ndị nkụzi Igbo iji mee ka ha mata maka ya na ndị ọzọ.
Project details | Contents |
---|---|
Number of Pages | 121 pages |
Chapter one | Introduction |
Chapter two | Literature review |
Chapter three | methodology |
Chapter four | Data analysis |
Chapter five | Summary,discussion & recommendations |
Reference | Reference |
Questionnaire | Questionnaire |
Appendix | Appendix |
Chapter summary | 1 to 5 chapters |
Available document | PDF and MS-word format |
DOWNLOAD COMPLETE WORK
All listed topics on our website are available project materials in PDF and MS word files, well supervised and approved by lecturers who are intellectual in their various fields of discipline, documented to assist you with complete, quality and well organized researched work. if you can't find what you're looking for feel free to contact us.
FOLLOW US